Proverbs 23

Okwu nke asaa

1Mgbe gị na onye na-achị achị nọdụrụ irikọ nri,
lezie ihe
Maọbụ, onye nọ nʼihu gị
dị nʼihu gị anya,
2tụkwasị mma nʼakpịrị gị,
ma ọ bụrụ na ị bụ onye iri oke nri na-atọ ụtọ.
3Achọsila nri ụtọ ya ike,
nʼihi na nri ahụ bụ nri aghụghọ.

Okwu nke asatọ

4Adọgbula onwe gị nʼọrụ maka ịbụ ọgaranya,
atụkwasịla obi na nghọta gị.
Maọbụ, ịdị nkọ gị

5Nʼihi na akụ nwere ike ifu
nʼotu ntabi anya dịka a ga-asị
na ha nwere nku dịka nnụnụ ugo.

Okwu nke itoolu

6Erila nri onye aka ntagide na-enye gị.
Nri ụtọ ya agụkwala gị agụ.
7Nʼihi na ọ bụ ụdị mmadụ ahụ
na-eche ọnụahịa ihe ọ na-emefuru gị.
Ọ na-asị gị, “Rie ihe, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ,”
ma obi ya adịghị nʼebe ị nọ.
8Ị ga-agbọkwa nke ntakịrị ahụ i riri
mgbe ahụ, okwu ọma ahụ niile i kwuru banyere ya ga-abụ ihe efu.

Okwu nke iri

9Atụfula ume gị ịgwa onye nzuzu okwu,
nʼihi na ọ ga-eleda okwu i sitere nʼezi uche kwuo anya.

Okwu nke iri na otu

10Anarala nwa na-enweghị nne na nna ala ya
site nʼihigharị oke ala e gwunyere site nʼoge gara aga,
11nʼihi na onye mgbapụta ha dị ike;
ya onwe ya ga-ekwuchitere ha ọnụ ha.

Okwu nke iri na abụọ

12Tinye uche gị nʼịdọ aka na ntị;
gekwaa ntị nụrụ okwu ihe ọmụma niile.

Okwu nke iri na atọ

13Ahapụla ịdọ ụmụ gị aka na ntị.
Ha agaghị anwụ nʼihi na ị tiri ha ihe.
14Jiri mkpara tie ya ihe
ma zọpụta ndụ ya site nʼọnwụ.

Okwu nke iri na anọ

15Nwa m, aga m aṅụrị ọṅụ nke ukwuu
ma ọ bụrụ na ị ghọọ onye maara ihe.
16Mkpụrụobi m ga-aṅụrị ọṅụ
mgbe egbugbere ọnụ gị abụọ kwuru ihe ziri ezi.

Okwu nke iri na ise

17Ekwela ka obi gị kwosa ndị mmehie ekworo,
kama nọgide nʼịnụ ọkụ nʼobi nʼịtụ egwu Onyenwe anyị mgbe niile,
18nʼihi na i nwere ọtụtụ ihe ọma nʼihu gị.
Olileanya dị ukwuu dịrị gị.

Okwu nke iri na isii

19Nwa m, nwee uche,
gbasookwa ụzọ Chineke.
20Anọla nʼetiti ndị na-aṅụbiga mmanya oke,
na ndị iri oke oriri na-atọ ụtọ,
21nʼihi na ihe niile ga-akọ ha.
Ọ bụkwa nkịrịnka akwa ka onye oke ụra na-eyi nʼahụ.

Okwu nke iri na asaa

22Ṅaa ntị nʼịdọ aka na ntị nna gị,
akpọkwala ịdọ aka na ntị nne gị bụ agadi nwanyị asị.
23Zụta eziokwu, erekwala ya,
zụtakwa amamihe, ntụziaka, na nghọta.
24Nna onye ezi omume ga-aṅụrị ọṅụ.
Ọ bụkwa ihe oke ọṅụ inweta nwa maara ihe.
25Ka nne na nna gị nwee obi ụtọ.
Ka onye mụrụ gị ṅụrịa.

Okwu nke iri na asatọ

26Nwa m, nye m obi gị
ka ụzọ m niile nyekwa anya gị ọṅụ.
27Nʼihi na onye akwụna bụ olulu miri emi,
nwanyị nwe di na-akwa iko bụ olulu mmiri dị warawara.
28Dịka onye ohi ka ọ na-echere
na-emekwa ka ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi baa ụba nʼetiti ụmụ nwoke.

Okwu nke iri na itoolu

29Onye ka obi ya jupụtara nʼahụhụ? Onye nọ na iru ụjụ?
Olee onye nwere esemokwu? Onye nwere ọtụtụ ihe mkpesa?
Onye nwere mmerụ ahụ nke na-abaghị uru? Onye nwere anya nke na-acha ọbara ọbara?
30Ọ bụ ndị na-anọ ogologo oge na-aṅụ mmanya,
onye na-aga ịchọpụta mmanya agwara agwa.
31Elekwasịla mmanya anya mgbe ọ na-acha ọbara ọbara,
mgbe ọ na-ezipụta ọdịdị ya nʼiko
mgbe ọ na-asụgharị nke ọma nʼime iko.
32Nʼikpeazụ, ọ na-ata dịka agwọ
na-atụkwa dịka ajụala.
33Anya gị abụọ ga-ahụ ihe ị na-amaghị isi ya na ọdụ ya,
obi gị ga-atụlekwa ihe ndị na-agbagwoju anya.
34Ị ga-adị ka onye na-edina nʼetiti oke osimiri,
nke na-edinakwa nʼelu ụdọ nʼejide ụgbọ.
35Ị ga-asị, “Ha tiri m ihe, ma emerụghị m ahụ.
Ha pịara m ihe, ma amaghị m.
Olee mgbe m ga-eteta,
ka m pụọ ga chọọ mmanya ọzọ?”
Copyright information for IboBIU